Psalms 50

Abụ Ọma Asaf.

Ofufe zuruoke

1 Onyenwe anyị, Chineke, Onye kachasị chi niile,
ekwuola okwu ma kpọkọta ụwa niile,
site na ọwụwa anyanwụ ruo na ọdịda ya.
2Chineke na-enwupụta dịka ìhè, site na Zayọn,
nke zuruoke nʼime ịma mma.
3Chineke anyị na-abịa,
ọ gaghị emechikwa ọnụ;
ọkụ na-erepịa erepịa dị nʼihu ya,
oke ifufe na-efesi ike gbakwara ya gburugburu.
4Ọ na-akpọku eluigwe
na ụwa ka o kpee ndị ya ikpe: Ọ na-asị,
5“Chikọtaranụ m ndị m e doro nsọ,
bụ ndị mụ na ha ji ịchụ aja gbaa ndụ.”
6Eluigwe na-ekwupụta ezi omume ya,
nʼihi na Chineke nʼonwe ya bụ onye ikpe. Sela

7“Nụrụnụ, ndị m, m ga-ekwukwa,
Izrel, aga m agba ama megide unu,
Abụ m Chineke, Chineke unu.
8Anaghị m abara unu mba nʼihi ịchụ aja unu,
na aja nsure ọkụ unu nke na-adị m nʼihu oge niile.
9Enweghị m mkpa maka oke ehi unu site nʼụlọ anụmanụ unu
maọbụ mkpi site nʼọgba igwe ewu na atụrụ unu,
10nʼihi na ụmụ anụmanụ niile nke oke ọhịa bụ nke m,
ha na ehi niile nọ nʼelu otu puku ugwu.
11Amaara m ụmụ nnụnụ niile nọ nʼelu ugwu niile,
ihe niile e kere eke nọ nʼọhịa bụ nke m.
12Ọ bụrụ na agụụ agụọ m, agaghị m agwa gị ya,
nʼihi na ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke m.
13Ana m ata anụ oke ehi,
ka ọ bụ ọbara mkpi ka m ga-aṅụ?

14“Chụọrọ Chineke aja ekele,
mezuo nkwa i kwere Onye kachasị ihe niile elu,
15ma kpọkuo m nʼụbọchị nsogbu gị,
aga m agbapụta unu, unu ga-enyekwa m nsọpụrụ.”
16Ma Chineke na-agwa ndị na-eme ihe ọjọọ okwu sị,

“Olee, nkwuwa okwu unu nwere ịgụgharị iwu m,
maọbụ kwupụta ọgbụgba ndụ m nʼọnụ unu?
17Unu kpọrọ ndụmọdụ m asị,
na-atụfekwa okwu m nʼazụ unu.
18Mgbe unu hụrụ onye ohi, unu na ya na-ejikọta aka;
unu na ndị na-akwa iko na-ekekọkwa oke.
19Ọnụ unu na-eme ọsịịsọ ikwu okwu ọjọọ,
okwu aghụghọ na nke rere ure na-esikwa nʼọnụ unu na-asọpụta dịka iyi.
20Unu na-ekwugide ụmụnna unu mgbe niile,
na-ekwutọkwa nwanne unu nwoke.
21Ihe ndị a ka unu mere ma agbachiri m nkịtị;
unu chekwara na adị m ka unu.
Ma aga m abara unu mba
ma bokwaa unu ebubo unu nʼihu unu.

22“Tụgharịa uche na nke a, unu ndị na-echefu Chineke,
ma ọ bụghị ya, aga m adọrisi unu, ọ dịkwaghị onye ga-agbapụta unu.
23Onye na-eji ekele achụrụ m aja, na-asọpụrụ m,
ọ bụkwa onye na-edozi ụzọ ya, ka m ga-eme ka ọ hụ nzọpụta Chineke.”
Copyright information for IboBIU